Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọrụ Ndị Ozi 13:26-41

Ọrụ Ndị Ozi 13:26-41 BIU

“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile. Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ. Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya. Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya. Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. “Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha. O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’ Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’ E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’ “Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure. Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure. “Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu. A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume. Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu. “ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo, nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi. Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu nke unu na-agaghị ekwe na o mere, ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’”