Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Ndị Eze 8:1-15

2 Ndị Eze 8:1-15 BIU

Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na ONYENWE ANYị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.” Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa. Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya. Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.” Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.” Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere. Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia. Mgbe ihe ndị a gasịrị Ịlaisha gara Damaskọs, isi obodo ndị Siria. Nʼoge a, Ben-Hadad eze Aram, na-arịa ọrịa. “A gara gwa eze na onye nke Chineke abịala nʼebe ahụ.” Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta ONYENWE ANYị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ” Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ” Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma ONYENWE ANYị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.” Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa. Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.” Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?” Ịlaisha zara, “ONYENWE ANYị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.” Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.” Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.