Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Ndị Kọrint 8:16-24

2 Ndị Kọrint 8:16-24 BIU

Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi. Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka. Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ. Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka. Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a. Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa. Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ. Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto. Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya.