Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị. Ma enweghị m izuike nʼime obi m, nʼihi na ahụghị m Taịtọs ezi nwanna m nʼebe ahụ. Nke a mere m jiri kelee ha hapụ ha gawa Masidonia. Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya. Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi. Nʼetiti ndị ahụ na-ala nʼiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nʼetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Onye zuru ime ihe ndị a? Nʼihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahịa. Kama, nʼime Kraịst anyị na-ekwu okwu anyị site nʼobi dị ọcha, dịka ndị ahụ Chineke zipụrụ ịrụ ọrụ a.
Gụọ 2 Ndị Kọrint 2
Geere nke a ntị 2 Ndị Kọrint 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 2 Ndị Kọrint 2:12-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo