Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Ihe E Mere 6:1-11

2 Ihe E Mere 6:1-11 BIU

Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “ONYENWE ANYị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii. Ma ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi!” Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha. Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị ONYENWE ANYị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị, ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ, maọbụ họpụta onye ọbụla ka ọ bụrụ onyendu ndị m Izrel. Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’ “Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel. Ma ONYENWE ANYị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi, iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m. Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ya, kama nwa gị nwoke nke si nʼahụ gị pụta ga-ewu ụlọnsọ ahụ nye Aha m.’ “Ugbu a, ONYENWE ANYị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna Devid, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka ONYENWE ANYị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel. Nʼebe ahụ ka m dọbara igbe ọgbụgba ndụ, nʼime ya ka ọgbụgba ONYENWE ANYị dị, bụ nke ya na ụmụ Izrel gbara.”