Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Ihe E Mere 33:10-19

2 Ihe E Mere 33:10-19 BIU

ONYENWE ANYị gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị. Nʼihi ya, ONYENWE ANYị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn. Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka ONYENWE ANYị Chineke nna nna ya. ONYENWE ANYị nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na ONYENWE ANYị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda. O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha. Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja ONYENWE ANYị dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee ONYENWE ANYị Chineke nke Izrel ofufe. Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị ONYENWE ANYị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile. Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma.