Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Ihe E Mere 32:24-33

2 Ihe E Mere 32:24-33 BIU

Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ ONYENWE ANYị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube. Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee ONYENWE ANYị megide ya na ndị Jerusalem na Juda. Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe ONYENWE ANYị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ. Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya. O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya. O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba. Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma. Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi. Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile. Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.