Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYị; nʼime ONYENWE ANYị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị. “O nweghị onye dị nsọ dịka ONYENWE ANYị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị. “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile. “Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. “ONYENWE ANYị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. ONYENWE ANYị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke ONYENWE ANYị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa. Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa. Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide ONYENWE ANYị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. ONYENWE ANYị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.
Gụọ 1 Samuel 2
Geere nke a ntị 1 Samuel 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Samuel 2:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo