Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Samuel 17:32-58

1 Samuel 17:32-58 BIU

Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.” Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.” Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ! ONYENWE ANYị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka ONYENWE ANYị nọnyere gị.” Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi. Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha. Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ. Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya. O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya. Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ. Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!” Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. Taa ka ONYENWE ANYị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel. Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na ONYENWE ANYị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke ONYENWE ANYị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.” Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya. Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala. Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya. Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ. Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn. Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ. Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya. Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?” Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.” Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.” Mgbe Devid si nʼigbu onye Filistia ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye Filistia a dịkwa nʼaka Devid. Sọl jụrụ ya sị, “Nwokorobịa, nwa onye ka ị bụ?” Devid zara sị, “Abụ m nwa ohu gị nwoke Jesi onye Betlehem.”