Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Amamihe Solomọn dị ukwuu karịa amamihe ndị si ọwụwa anyanwụ. Nʼezie, ọ dị ukwuu karịakwa amamihe ndị maara ihe nʼIjipt. Ọ maara ihe karịa onye ọbụla, karịa Etan onye Ezra, na Heman, na Kalkol, na Dada, ụmụ ndị ikom Mahol. Ihe banyere ịdị ukwuu ya gbasara na mba niile gbara ha gburugburu. Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise. O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ. Ndị eze niile dị nʼụwa bụ ndị bịara ịnụrụ banyere amamihe ya zitere ndị si na mba niile dị iche iche ịnụrụ okwu amamihe Solomọn.
Gụọ 1 Ndị Eze 4
Geere nke a ntị 1 Ndị Eze 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ndị Eze 4:29-34
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị