ONYENWE ANYị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram. Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị. Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu. Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.” Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya. Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.” Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?” Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya.
Gụọ 1 Ndị Eze 19
Geere nke a ntị 1 Ndị Eze 19
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ndị Eze 19:15-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị