Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam, nwa Solomọn. Ma okwu Chineke rutere Shemaya onye nke Chineke ntị, sị, “Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na ndị Juda niile, na Benjamin na ndị ọzọ niile, sị ha, Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu ONYENWE ANYị, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka ONYENWE ANYị nyere nʼiwu.
Gụọ 1 Ndị Eze 12
Geere nke a ntị 1 Ndị Eze 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ndị Eze 12:21-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị