Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Ndị Eze 10:14-29

1 Ndị Eze 10:14-29 BIU

Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ, na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ. Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru kilogram isii na ụma itoolu ka eji kpụọ ọta ọbụla. Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn. Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie. Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii, o nwere elu dị gburugburu nʼazụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha. Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye. Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn. Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nʼoke osimiri, tinyere ụgbọ nke Hiram. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ mmiri ndị a na-alọta, buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata. Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nwekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa. Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya. Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ. Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ. Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche. A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ. Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii, jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.