Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Ndị Kọrint 9:1-18

1 Ndị Kọrint 9:1-18 BIU

Abụghị m onye nwe onwe ya? Abụghị m onyeozi Kraịst? Ọ bụ na m ahụghị Jisọs Onyenwe anyị? Unu abụghị ihe ngosipụta ọrụ m rụrụ nʼime Onyenwe anyị? Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị. Ihe ngọpụ m nye ndị ahụ na-enyocha m bụ nke a. Ọ bụ na anyị enweghị ike iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ? Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa? Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri? Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta? Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ? Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a? E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta. Mkpụrụ anyị kụrụ nʼime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ụfọdụ nʼime akụnụba unu? Ọ bụrụ na ndị ọzọ kwesiri iketa uru dị otu a nʼahụ unu, ọ bụ na anyị ekwesighị iketa karịa? Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọbụla, kama anyị na-agbalịsị ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nʼoziọma Kraịst nke anyị wetara. Ọ bụ na unu amataghị na ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu na-esi nʼụlọnsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri? Ndị na-agbakwa odibo nʼebe ịchụ aja na-eketakwa oke nʼihe eji chụọ aja? Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ. Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye. Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma. A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka. Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.