Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo. Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike. Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru. Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ. Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị. Ya mere, dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”
Gụọ 1 Ndị Kọrint 1
Geere nke a ntị 1 Ndị Kọrint 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ndị Kọrint 1:26-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị