Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha. Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.) Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea. Ndị ọzọ bụ, Jeziel na Pelet ụmụ Azmavet, Beraka, Jehu onye Anatot, Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ, Jeremaya, Jahaziel, Johanan, Jozabad onye Gedera, Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf; Elkena, Ishaya, Azarel, Joeza na Jashobeam, ndị Kora; Juela na Zebadaya ụmụ Jeroham onye Gedoa.
Gụọ 1 Ihe E Mere 12
Geere nke a ntị 1 Ihe E Mere 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: 1 Ihe E Mere 12:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị