1
NKPUGHE 16:15
Bible Nso
(Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n'ọtọ, ha we hu ihere-ya.)
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa NKPUGHE 16:15
2
NKPUGHE 16:12
Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.
Nyochaa NKPUGHE 16:12
3
NKPUGHE 16:14
n'ihi na ha bu mọ nke ndi-mọ ọjọ, nēme ihe-iriba-ama di iche iche; ndi nāpukuru ndi-eze nke elu-uwa dum madu bi, ime ka ha zukọ ibu agha nke oké ubọchi ahu nke Chineke, Onye puru ime ihe nile.
Nyochaa NKPUGHE 16:14
4
NKPUGHE 16:13
M'we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n'ọnu dragon ahu, si kwa n'ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n'ọnu onye-amuma ugha ahu, puta
Nyochaa NKPUGHE 16:13
5
NKPUGHE 16:9
Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.
Nyochaa NKPUGHE 16:9
6
NKPUGHE 16:2
Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.
Nyochaa NKPUGHE 16:2
7
NKPUGHE 16:16
Ha we me ka ha zukọ n'ebe ahu nke anākpọ n'asusu Hibru Amagedọn.
Nyochaa NKPUGHE 16:16
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị