Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi mb͕e Onye-nwe ulo gābia, ma ọ bu n'anyasi, ma-ọbu n'etiti abali, ma-ọbu mb͕e oke-ọkuku kwara, ma-ọbu n'ututu; ka O we ghara ihu unu ka unu nāraru ura, ma ọ buru na Ọ bia na mberede. Ma okwu M'nāgwa unu ka M'nāgwa madu nile, Nēchenu nche.