Unu atula egwu eze Babilon, onye unu onwe-unu nātu egwu ya; unu atula egwu ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na unu ka M'nọyere, izọputa unu, na inaputa unu n'aka-ya. M'gēnye kwa unu ka enwe obi-ebere nile n'aru unu, ka o we nwe obi-ebere n'aru unu, me ka unu lata n'ala-unu.