Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n'ihi nka ka ihe a ruworo unu aru. Ma ub͕u a, le, atọpuwom i ta na nkpọrọ nke di n'aka-gi. Ọ buru na ọ di nma a'anya-gi isorom bia na Babilon, bia, anyam gādi kwa a'aru gi; ma ọ buru na ọ jọrọ njọ n'anya-gi isorom bia na Babilon, ghara: le, ala nka nile di n'iru gi; n'ebe di nma na n'ebe ziri ezi n'anya-gi ije, je n'ebe ahu.