Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è; ha si ya, Biko, si Shibolet; ọ si, Sibolet; n'ihi na o dozighi onwe-ya ikpọ ya nke-ọma; ha we jide ya, b͕ue ya na ngabiga-miri Jọdan: orú nnù ndikom uzọ ise na nnù ise we da mb͕e ahu site n'Efraim.