Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye Nsọ Israel: Mu onwem bu Jehova, Chineke-gi, Onye nēzí gi ime ihe nābà úrù, Onye nēme ka i zọ ije n'uzọ i gējeso. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n'ihe nile M'nyere n'iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri