Rigonu n'ugwu, bute osisi, wue ulo a, ọ gātọkwam utọ, agāsọpu-kwa-ram, ka Jehova siri. Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M'we fùsasia ya, N'ìhi gini? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N'ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya.