1
EKLISIASTIS 7:9
Bible Nso
Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa EKLISIASTIS 7:9
2
EKLISIASTIS 7:14
N'ubọchi ọdi-nma-gi nọ n'ọdi-nma, ma n'ubọchi ọdi-njọ le anya: ọbuná otù na nso ibe-ya ka Chineke meworo ha, ka madu we ghara ichọputa ihe ọ bula nke gādi mb͕e ọ gasiri.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:14
3
EKLISIASTIS 7:8
Ikpe-azu ihe di nma kari nmalite-ya: ọ di nma, bú onye mọ-ya nwere ogologo-ntachi-obi, kari onye mọ-ya di elu.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:8
4
EKLISIASTIS 7:20
N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:20
5
EKLISIASTIS 7:12
N'ihi na amam-ihe bu ǹdò, ego bu kwa ǹdò: ma ọkaka nke ihe-ọmuma bu, na amam-ihe nēme ka onye-nwe-ya di ndu.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:12
6
EKLISIASTIS 7:1
Ezi aha di nma kari ezi manu-otite nēsì ísì utọ; ọzọ, ubọchi ọnwu madu di nma kari ubọchi amuru ya.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:1
7
EKLISIASTIS 7:5
Ọ di nma inu ibasi-nba-ike nke onye mara ihe, karia mb͕e madu nānu abù ndi-nzuzu.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:5
8
EKLISIASTIS 7:2
Ọ di nma ije n'ulo oruru-újú, kari ije n'ulo ọṅuṅu-manya-vine: n'ihi na nke ahu bu nsọtu madu nile; onye di ndu gētiye kwa ya n'obi-ya.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:2
9
EKLISIASTIS 7:4
Obi ndi mara ihe di n'ulo oruru-újú; ma obi ndi-nzuzu di n'ulo ọṅù.
Nyochaa EKLISIASTIS 7:4
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị