1
II. NDI KỌRINT 1:3-4
Bible Nso
Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile; Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa II. NDI KỌRINT 1:3-4
2
II. NDI KỌRINT 1:5
N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist.
Nyochaa II. NDI KỌRINT 1:5
3
II. NDI KỌRINT 1:9
e, ayi onwe-ayi enwewo ọziza azara nime onwe-ayi na ọ bu ọnwu, ka ayi we ghara itukwasi obi n'onwe-ayi, kama ọ bu na Chineke Onye nēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie
Nyochaa II. NDI KỌRINT 1:9
4
II. NDI KỌRINT 1:21-22
Ma Onye ahu Nke nēme ka ayi na unu guzosie ike nime Kraist, Onye te-kwa-ra-ayi manu n'isi, bu Chineke; Onye ka-kwa-ra ayi akàrà, nye kwa ayi Mọ Nsọ n'obi-ayi, bú ihe ayi ji mara na ayi gēnwezu nkwa ahu nile.
Nyochaa II. NDI KỌRINT 1:21-22
5
II. NDI KỌRINT 1:6
Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa
Nyochaa II. NDI KỌRINT 1:6
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị