1
Zefanaya 3:17
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
ONYENWE ANYị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Zefanaya 3:17
2
Zefanaya 3:20
Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka ONYENWE ANYị kwuru.
Nyochaa Zefanaya 3:20
3
Zefanaya 3:15
Nʼihi na ONYENWE ANYị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. ONYENWE ANYị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
Nyochaa Zefanaya 3:15
4
Zefanaya 3:19
Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
Nyochaa Zefanaya 3:19
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị