1
Zefanaya 1:18
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke ONYENWE ANYị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Zefanaya 1:18
2
Zefanaya 1:14
Oke ụbọchị ONYENWE ANYị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị ONYENWE ANYị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.
Nyochaa Zefanaya 1:14
3
Zefanaya 1:7
Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. ONYENWE ANYị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.
Nyochaa Zefanaya 1:7
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị