1
Abụ Ọma 62:8
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Abụ Ọma 62:8
2
Abụ Ọma 62:5
O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.
Nyochaa Abụ Ọma 62:5
3
Abụ Ọma 62:6
Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
Nyochaa Abụ Ọma 62:6
4
Abụ Ọma 62:1
Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.
Nyochaa Abụ Ọma 62:1
5
Abụ Ọma 62:2
Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
Nyochaa Abụ Ọma 62:2
6
Abụ Ọma 62:7
Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke, Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.
Nyochaa Abụ Ọma 62:7
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị