1
Abụ Ọma 40:1-2
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Eji m ndidi chere ONYENWE ANYị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m. O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Abụ Ọma 40:1-2
2
Abụ Ọma 40:3
O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime ONYENWE ANYị.
Nyochaa Abụ Ọma 40:3
3
Abụ Ọma 40:4
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme ONYENWE ANYị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
Nyochaa Abụ Ọma 40:4
4
Abụ Ọma 40:8
O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.”
Nyochaa Abụ Ọma 40:8
5
Abụ Ọma 40:11
O ONYENWE ANYị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
Nyochaa Abụ Ọma 40:11
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị