Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile
zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
tọọ ntị gị nʼala nye amamihe,
wepụta obi gị inwe nghọta.
E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,
ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha
maọbụ akụ nke zoro ezo,
mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu ONYENWE ANYị
chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.