1
Joshua 10:13
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Joshua 10:13
2
Joshua 10:12
Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara ONYENWE ANYị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon”
Nyochaa Joshua 10:12
3
Joshua 10:14
O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị ONYENWE ANYị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na ONYENWE ANYị na-eburu Izrel agha.
Nyochaa Joshua 10:14
4
Joshua 10:8
Ma ONYENWE ANYị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.”
Nyochaa Joshua 10:8
5
Joshua 10:25
Joshua sịrị ha, “Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha.”
Nyochaa Joshua 10:25
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị