1
Joshua 1:9
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Joshua 1:9
2
Joshua 1:8
Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.
Nyochaa Joshua 1:8
3
Joshua 1:7
“Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga.
Nyochaa Joshua 1:7
4
Joshua 1:5
Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.
Nyochaa Joshua 1:5
5
Joshua 1:6
Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie.
Nyochaa Joshua 1:6
6
Joshua 1:3
Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu.
Nyochaa Joshua 1:3
7
Joshua 1:2
“Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel.
Nyochaa Joshua 1:2
8
Joshua 1:1
Mgbe Mosis, bụ odibo ONYENWE ANYị nwụrụ, ONYENWE ANYị gwara Joshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka okwu sị
Nyochaa Joshua 1:1
9
Joshua 1:4
Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ.
Nyochaa Joshua 1:4
10
Joshua 1:18
Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”
Nyochaa Joshua 1:18
11
Joshua 1:11
“Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ ONYENWE ANYị bụ Chineke na-enye unu.’ ”
Nyochaa Joshua 1:11
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị