1
Jeremaya 8:22
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead? Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ? Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m nʼihi mmerụ ahụ ha niile?
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Jeremaya 8:22
2
Jeremaya 8:4
“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
Nyochaa Jeremaya 8:4
3
Jeremaya 8:7
Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe ONYENWE ANYị chọrọ site nʼaka ha.
Nyochaa Jeremaya 8:7
4
Jeremaya 8:6
Aṅaala m ntị, ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta. O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị, “Gịnị bụ ihe a m mere?” Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya, dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.
Nyochaa Jeremaya 8:6
5
Jeremaya 8:9
A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu ONYENWE ANYị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
Nyochaa Jeremaya 8:9
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị