Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru,
“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,
onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,
onye wezugara obi ya site nʼebe ONYENWE ANYị nọ.
Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.
Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,
nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.