Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka ONYENWE ANYị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, ONYENWE ANYị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.”