1
Aịzaya 60:1
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube ONYENWE ANYị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Aịzaya 60:1
2
Aịzaya 60:3
Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
Nyochaa Aịzaya 60:3
3
Aịzaya 60:2
Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma ONYENWE ANYị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.
Nyochaa Aịzaya 60:2
4
Aịzaya 60:22
Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo, mba nta ga-aghọ obodo buru ibu. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị, ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”
Nyochaa Aịzaya 60:22
5
Aịzaya 60:19
Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
Nyochaa Aịzaya 60:19
6
Aịzaya 60:20
Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na ONYENWE ANYị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.
Nyochaa Aịzaya 60:20
7
Aịzaya 60:5
Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
Nyochaa Aịzaya 60:5
8
Aịzaya 60:4
“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
Nyochaa Aịzaya 60:4
9
Aịzaya 60:21
Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.
Nyochaa Aịzaya 60:21
10
Aịzaya 60:18
Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.
Nyochaa Aịzaya 60:18
11
Aịzaya 60:11
Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.
Nyochaa Aịzaya 60:11
12
Aịzaya 60:6
Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
Nyochaa Aịzaya 60:6
13
Aịzaya 60:10
“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
Nyochaa Aịzaya 60:10
14
Aịzaya 60:15
“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.
Nyochaa Aịzaya 60:15
15
Aịzaya 60:16
Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
Nyochaa Aịzaya 60:16
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị