Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru ONYENWE ANYị
ijere ya ozi,
na ịhụ aha ONYENWE ANYị nʼanya,
nakwa ị bụ ndị ohu ya,
ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya,
na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,
ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m,
meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m.
Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere
nʼebe ịchụ aja m.
Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m
Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”