Ọ bụ m bụ ONYENWE ANYị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;
ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Ọ bụ ezie na ị maghị m,
ma aga m eme ka ị dịrị ike.
Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ
ruo nʼọdịda anyanwụ,
ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.
Abụ m ONYENWE ANYị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.