1
Aịzaya 30:21
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Aịzaya 30:21
2
Aịzaya 30:18
Ma ONYENWE ANYị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na ONYENWE ANYị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
Nyochaa Aịzaya 30:18
3
Aịzaya 30:15
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla.
Nyochaa Aịzaya 30:15
4
Aịzaya 30:20
Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.
Nyochaa Aịzaya 30:20
5
Aịzaya 30:19
Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.
Nyochaa Aịzaya 30:19
6
Aịzaya 30:1
“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie.
Nyochaa Aịzaya 30:1
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị