1
Aịzaya 19:25
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Aịzaya 19:25
2
Aịzaya 19:20
Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru ONYENWE ANYị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
Nyochaa Aịzaya 19:20
3
Aịzaya 19:1
Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, ONYENWE ANYị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
Nyochaa Aịzaya 19:1
4
Aịzaya 19:19
Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ ONYENWE ANYị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye ONYENWE ANYị nʼoke ala ha.
Nyochaa Aịzaya 19:19
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo