Mgbe ahụ ONYENWE ANYị zara m sị,
“Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe.
Depụta ya nke ọma,
ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya.
Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,
ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ,
Ọ gaghị abụkwa ụgha.
Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya,
nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo,
ọ gaghị anọ tee aka.