1
Jenesis 15:6
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ebram kweere nʼihe ONYENWE ANYị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Jenesis 15:6
2
Jenesis 15:1
Mgbe nke a gasịrị, okwu ONYENWE ANYị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.”
Nyochaa Jenesis 15:1
3
Jenesis 15:5
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.”
Nyochaa Jenesis 15:5
4
Jenesis 15:4
Ma okwu ONYENWE ANYị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.”
Nyochaa Jenesis 15:4
5
Jenesis 15:13
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ.
Nyochaa Jenesis 15:13
6
Jenesis 15:2
Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.”
Nyochaa Jenesis 15:2
7
Jenesis 15:18
Nʼụbọchị ahụ ka ONYENWE ANYị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, “Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis.
Nyochaa Jenesis 15:18
8
Jenesis 15:16
Mgbe ọgbọ anọ gasịrị, ụmụ ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala a. Nʼihi na mmehie ndị Amọrait erubeghị nʼuju ya.”
Nyochaa Jenesis 15:16
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị