Mgbe ONYENWE ANYị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị, na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ, leruonu anya, ka unu ghara ichefu ONYENWE ANYị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.