1
Ọrụ Ndị Ozi 3:19
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 3:19
2
Ọrụ Ndị Ozi 3:6
Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 3:6
3
Ọrụ Ndị Ozi 3:7-8
O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike. Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 3:7-8
4
Ọrụ Ndị Ozi 3:16
Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 3:16
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị