1
2 Samuel 22:3
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa 2 Samuel 22:3
2
2 Samuel 22:31
“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ ONYENWE ANYị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
Nyochaa 2 Samuel 22:31
3
2 Samuel 22:2
Ọ sịrị: “ONYENWE ANYị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
Nyochaa 2 Samuel 22:2
4
2 Samuel 22:33
Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
Nyochaa 2 Samuel 22:33
5
2 Samuel 22:29
Ọ bụ gị, ONYENWE ANYị, bụ oriọna m, ONYENWE ANYị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
Nyochaa 2 Samuel 22:29
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị