1
2 Ihe E Mere 7:14
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa 2 Ihe E Mere 7:14
2
2 Ihe E Mere 7:15
Anya m ga-eghere oghe mgbe niile; otu a kwa, ntị m ga-egherekwa oghe ịhụ na ịnụ ekpere niile a na-ekpe nʼụlọnsọ a.
Nyochaa 2 Ihe E Mere 7:15
3
2 Ihe E Mere 7:16
Edoola m ụlọnsọ a nsọ nye onwe m, ka Aha m dị nʼebe ahụ ruo ebighị ebi; anya m abụọ na obi m ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
Nyochaa 2 Ihe E Mere 7:16
4
2 Ihe E Mere 7:13
“Mgbe ọbụla m mere ka mmiri ghara izo, maọbụ zidata igurube ka ha bịa bibie ihe ubi unu, maọbụ zidata ọrịa nʼetiti unu
Nyochaa 2 Ihe E Mere 7:13
5
2 Ihe E Mere 7:12
ONYENWE ANYị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja.
Nyochaa 2 Ihe E Mere 7:12
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị