Ndị ọbụ abụ ahụ na ndị na-afụ opi jikọrọ onwe ha ọnụ were otu olu bụkuo ONYENWE ANYị abụ ekele na otuto. Ndị na-afụ opi, na ndị na-akụ ọla na-ada ụda, na ndị ji ngwa egwu ndị ọzọ sonyeere ha, welie olu ha elu too ONYENWE ANYị nʼabụ sị:
“Nʼihi na Ọ dị mma
Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.”
Mgbe ahụ igwe ojii jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, nke mere na ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube ONYENWE ANYị jupụtara nʼime ụlọnsọ Chineke.