Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI ROM 12:10

Udo Ahụ N'efunahụ Anyị
Ụbọchị asaa
Ọ̀ gà-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtarà na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasịrị anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwerè ajụjụ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị asaa, isorò usoro ozi Pastọ Craig Groeschel, anyị gà-ekpughe otù anyị gà-esi chọta Udo Ahụ N'efunahụrụ anyị nke anyị niile nà-achọsi ike.

Igba Mbọ Nsọ: Nabata Ndụ Nke Ịrụsi Ọrụ Ike, Na Izukwà Ike Ka Ị Kwesịrị
Ụbọchị Iri
Nha zuru ezù. Bụ̀ ihe n'agụ́si anyị agụụ ike maka ndụ anyị ka anyị na-anụ mkpú gasị nke "rusie ọrụ ike!" n'otu ntị, na "zùtúkwuó ike" na ntị nke ọzọ. Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na atụmatụ Chineke maka anyị abụghị naanị otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ? Ebe a ka ịgba mbọ nsọ na-abata—ụzọ obibi ndị nke irusi ọrụ ike na izu ike n'ụzọ gasị n'enye Chineke otuto.

Ekpere
Ụbọchị Iri Abụọ Na Otu
Mụta ụzọ kachasị mma e si ekpe ekpere, site n'ekpere ndị kwere-ekwe na nke Jizọs n'onwe Ya kperè. Chọta agbamume iji ogologo ntachi obi na ndidi wee n'ebugara Chineke arịrịọ gị kwa ụbọchị. Chọpụta ma hụ ọmụmaatụ gasị nke ekpere n'enweghị uru dị na ha, nke ezi-omume-nke-onwe, tụnyere ekpere nke ndị dị ọcha n'obi kperè. Kpee ekpere n'esepụghị aka.