Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ABÙ ỌMA 30:5

Ǹkà nke Imeri
Ụbọchi Asaa
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.

Gini Bụ Ezi Ịhụnanya? Igodo: aha aha?
Ụbochị Iri abụa
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ n'ezie. Ma ọ bụ mmadụ ole na ole na-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ a sitere na Thistlebend Ministries na-enyocha ihe ịhụnanya pụtara na Akwụkwọ Nsọ na otu a ga-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma. Igodo: gbasara gbasara.

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime Chineke
Ụbọchị Iri ato
Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.