Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 6:26
Ihe Niile M Chọrọ
Ụbọchị Atọ
Chineke agawori n'ihu anyị ma sikwa n'azụ n'echebe anyị. Agha anyị niile bụ nke Ọ luchagorò. O kpuchigorì ebe ọbụla dị oghe nke ndụ anyị. Ọ dịghị ihe ọ bụla gbasara anyị na-adị Ya ka ihe ọhụrụ. Ihe ofufè nke ụbọchị ato a akpachara anya mee, ga-eme ka ị dị mgbamume n'ime eziokwu bụ na Chineke bụ Onye n'enye okè kpọmkwem, nha kpọmkwem, maka ndụ gị.
Jizọs, Achọrọ M Gị!
Ụbọchị Atọ
Inwe Jizọs dị ka enyi na ndụ gị ọ bụ ihe dị gị oké mkpa? Atụmatụ ihe ọgụgụ a nke ụbọchị atọ bụ nke emebere iji mee ka ọnịnọ gị na Jizọs dịkwuo oké omimi ma nyere gị aka itikụ̀ Ya. Ọ bụkwa ekpere nsogidé nye usoro agụmagụ bụ “Jizọs, Achọrọ M Gị” sitere na Thistlebend Ministries.
Agụụ
4 Ụbọchị
Atụmatụ maka ụbọchị anọ a na-enyocha etú agụụ na-agụ anyị ịmata Chineke ma mee kà amata Ya, sì àkpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Chọpụta ihe mere Devid ji bụrụ nwoke na-eso obi Chineke - na etu gị onwe gị ga-esi ebi ndụ na-enwe mmasị n'ebe Chineke nọ, na-egori mmekọrịta gị na Jizọs, na-atụkwasị ya obi ka o gboo mkpa gị. YouVersion chepụtara atụmatụ a.
Nchedo: Izere akwa ụta na ndụ gị
ụbọchị ise
Nchedo a na-etinye iji gbochie ugbo ala anyị site na I banye na ebe ndị dị ize ndụ ma ọ bụ na-agaghị apụ. Anyị anaghị ahụkarị ha ruo mgbe anyị chọrọ ha — mgbe ahụ anyị ji n'aka na ha nwere ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ma ọ bụrụ na anyị nwere nchedo na mmekọrịta anyị, akụnụba anyị, na ọrụ anyị? Kedu ihe ndị ahụ nwere ike ịdị ka? Olee ihe ha ga-eme ka anyị ghara ịkwa ụta ọ bụla? Maka ụbọchị ise sochirinụ, ka anyị nyocha etu esi edobe nchedo nkeonwe anyi.
Nye Chineke Ọnọdụ Mbụ
5 Ụbọchị
Inye Chineke ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị abụghị ihe omume otu mgbe . . . ọ bụ usoro nke ogologo ndụ nke Onye Kraịst ọ bụla. Ma ị bụ onye ọhụrụ n’okwukwe ma ọ bụ onye “nara eso ụzọ Kraịst”, ị ga-ahụta atụmatụ a ka ọ dị mfe nghọta na itinye n’ọrụ, yana atụmatụ dị irè nke ukwuu maka ibi ndụ Ndị Kraịst na-emeri.
Mee Njem N'ebughí Nnukwu Ibu
Ụbọchi Asaa
N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.
Nchegbu N'efu
Ụbọchị asaa
Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere na Life.Church, na-esote usoro ozi Pastọ Craig Groeschel Nchegbu N'efu.